Song of Solomon 7

1Lee ka ụkwụ gị si dị mma nʼime akpụkpọụkwụ
gị ada nwa eze.
Apata ụkwụ gị abụọ dị ezi mma dịka nkume oke ọnụahịa,
ọrụ aka nke ezigbo onye ọkwa ǹka.
2Otubo gị mara mma
dịka iko nke a gbajuru mmanya.
Ukwu gị dị ka ukwu ọka
e ji okoko urodi gbaa gburugburu.
3Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ
nke otu nne mụrụ nʼotu oge.
4Olu gị guzo kwem dị ka ụlọ elu e ji ọdụ wuo.
Anya gị abụọ dị ka ọdọ mmiri Heshbọn
nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Bat-Rabim.
Imi gị mara mma dị ka ụlọ elu Lebanọn
nke chere Damaskọs ihu.
5Isi gị guzo nʼahụ gị ka ugwu Kamel.
Agịrị isi nke isi gị dịkwa ogho odo odo.
Ihe akpara akpa nke e jiri mara onye a na-enye nsọpụrụ

Ịma mma nke agịrị isi gị emela eze onye a dọtara nʼagha.
6Lee ka i si maa mma nke ukwuu, nʼezie, ị mara mma.
Ị dịkwa ụtọ nke ukwuu, gị onye m hụrụ nʼanya.
7Ị dị ogologo dịka osisi nkwụ;
ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ osisi.
8Ekwuru m sị, “Aga m arịgoro elu osisi nkwụ ahụ,
jidekwa mkpụrụ ya aka.”
Ugbu a, ka ara gị abụọ dịkwa ka ụyọkọ mkpụrụ vaịnị,
ka isisi nke iku ume gị dịkwa ka mkpụrụ osisi apụl,
9ka okpo ọnụ gị dịka mmanya makarịsịrị na mma.
Onye a hụrụ nʼanya

Ka mmanya ahụ gbadaa nwayọọ nye onye m hụrụ nʼanya,
na-asọda nwayọọ nʼelu egbugbere ọnụ ya na eze ya.
10Abụ m nke onye ahụ m hụrụ nʼanya,
ọ bụkwa m ka ọ chọrọ.
11Bịa, onye m hụrụ nʼanya, ka anyị gaa nʼime obodo,
ka anyị nọọ ọnọdụ abalị nʼobodo nta.
12Ka anyị bilie ngwangwa nʼisi ụtụtụ pụọ jee nʼubi
lee ma osisi vaịnị ha amaala ifuru,
ma okoko ya agbawaala,
ma osisi pomegranet agbawaala okoko.
Nʼebe ahụ ka m ga-egosi gị ịhụnanya m.
13Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nụ isi nke mandreki
Dịka ndị mmadụ na-ekwu, mandreki na-eweta mkpali ọchịchọ mmekọrịta nʼahụ mmadụ, na-emekwa ka nwanyị tara ya tụrụ ime. Jen 30:14
na-ewepụta;
mkpụrụ osisi niile na-atọ ụtọ ga-adịkwa nʼọnụ ụzọ anyị,
ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie,
nʼihi na edokọtaala m ha maka onye m hụrụ nʼanya.
Copyright information for IboBIU